I. NDI-EZE 13:16-18
I. NDI-EZE 13:16-18 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ma ọ sịrị, “Apụghị m iso gị laghachi azụ, maọbụ rie nri, ma ọ bụkwa ṅụọ mmiri ọbụla nʼebe a. Nʼihi na a gwara m site nʼokwu ONYENWE ANYị sị, ‘Erikwala nri maọbụ ṅụọ mmiri nʼebe ahụ, maọbụ soro ụzọ ị si gaa lọtakwa.’ ” Ma onye nke ọzọ sịrị ya, “Mụ onwe m bụkwa onye amụma dịka gị, mmụọ ozi zikwara m ozi site nʼokwu ONYENWE ANYị sị, ‘Kpọrọ ya ka o soro gị laghachi nʼụlọ gị, ka o rie nri, ṅụọkwa mmiri.’ ” (Ma ọ gwara ya okwu ụgha.)
I. NDI-EZE 13:16-18 Bible Nso (IGBOB)
Ọ si, Apughm isoro gi laghachi, ma-ọbu isoro gi ba n'ulo: m'gaghi-esoro kwa gi ri nri ma-ọbu iṅu miri n'ebe a: n'ihi na okwu rurum nti n'okwu Jehova, si, Erila nri, aṅu-kwa-la miri, n'ebe ahu, alaghachi-kwa-la ila n'uzọ ahu i jere nime ya. Ọ si ya, Mu onwem bu kwa onye-amuma dika gi; mọ-ozi we gwam okwu n'okwu Jehova, si, Me ka o soro gi lata n'ulo-gi, ka o we rie nri ṅu kwa miri. Ma ọ gwara ya okwu-ugha.