Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

I. JỌN 4:14-15 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile

I. JỌN 4:14-15 IGBOB (Bible Nso)

Ayi onwe-ayi ahuwo kwa, ayi nāb͕a kwa àmà, na Nna-ayi ezitewo Ọkpara-Ya ka Ọ buru Onye-nzọputa nke uwa. Onye ọ bula nke gēkwuputa na Jisus bu Ọkpara Chineke, Chineke nānọgide nime ya, ya onwe-ya nānọgide kwa nime Chineke.

I. JỌN 4:14-15 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)

Ma anyị onwe anyị ahụla ma na-agbakwa ama na Nna ahụ zitere Ọkpara ya ka ọ bụrụ Onye nzọpụta nke ụwa. Chineke bi nʼime onye ọbụla nke na-ekwupụta na Jisọs bụ Ọkpara Chineke. Onye dị otu a bikwa nʼime Chineke.