I. JỌN 4:1-6
I. JỌN 4:1-6 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ndị enyi m hụrụ nʼanya, unu ekwenyela okwu mmụọ niile, kama nwaleenụ mmụọ niile ahụ i mata ma ha si na Chineke, nʼihi na ọtụtụ ndị amụma ụgha apụọla baa nʼime ụwa. Otu a ka unu ga-esi mata Mmụọ nke Chineke: Mmụọ ọbụla nke na-ekwupụta na Jisọs Kraịst abịala nʼanụ ahụ sitere na Chineke. Ma mmụọ ọbụla nke na-adịghị ekwupụta Jisọs esiteghị na Chineke, mmụọ dị otu a bụ nke onye ahụ na-emegide Kraịst nke unu nụrụ na ọ ga-abịa, ma ugbu a ọ bịala nʼụwa. Ụmụntakịrị m, unu bụ ndị sitere na Chineke, unu emeriekwala ha nʼihi na onye ahụ nke bi nʼime unu dị ukwuu karịa onye ahụ nọ nʼime ụwa. Nʼihi na ndị a si nʼime ụwa pụta. Ya mere, ihe ha na-ekwu okwu ya bụ naanị ihe banyere ụwa. Ụwa na-aṅakwa ha ntị. Anyị sitere na Chineke, onye ọbụla maara Chineke na-ege anyị ntị, ma onye ọbụla na-esiteghị na Chineke anaghị ege anyị ntị. Ọ bụ otu a ka anyị si amata mmụọ eziokwu na mmụọ nke okwu ụgha.
I. JỌN 4:1-6 Bible Nso (IGBOB)
Ndi m'huru n'anya, unu ekwela okwu mọ nile, kama nwaputanu udi-mọ ahu, ma ha bu ndi siri na Chineke puta: n'ihi na ọtutu ndi-amuma ugha apuwo ba n'uwa. Nime nka ka unu mara Mọ nke Chineke: mọ ọ bula nke nēkwuputa na Jisus Kraist abiawo n'anu-aru bu mọ nke siri na Chineke puta: ma mọ ọ bula nke nādighi-ekwuputa Jisus, o sighi na Chineke puta: nka bu kwa mọ nke onye ahu nēmegide Kraist, nke unu nuworo na ọ nābia; ọ bu kwa n'oge di ub͕u a ka ọ nọ n'uwa. Umu-ntakirim, unu onwe-unu bu ndi siri na Chineke puta, unu emeriwo kwa ha: n'ihi na Onye ahu Nke nọ nime unu ka onye ahu nke nọ n'uwa uku. Ndi ahu bu ndi nke uwa: n'ihi nka ha nēkwu okwu nke si n'uwa puta, uwa nānu kwa olu-ha. Ayi onwe-ayi bu ndi siri na Chineke puta: onye mara Chineke nānu olu-ayi; onye nēsighi na Chineke puta adighi-anu olu-ayi. Ayi sitere na nka mara mọ ezi-okwu ahu, na mọ nduhie ahu.