I. JỌN 2:12-14
I. JỌN 2:12-14 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ana m edere unu ihe ndị a ụmụntakịrị m nʼihi na a gbagharala unu mmehie niile site nʼaha ya. Ana m edere unu ndị bụ nna ihe ndị a, nʼihi na unu maara onye ahụ na-adị site na mbụ. Ana m edere unu ụmụ okorobịa, nʼihi na unu emeriela ajọ onye ahụ. Ana m edere unu ụmụntakịrị, nʼihi na unu maara nna ahụ. Ana m edere unu ndị nna, nʼihi na unu maara onye ahụ na-adị site na mbụ. Ana m edere unu ụmụ okorobịa, nʼihi na unu siri ike, okwu Chineke na-ebikwa nʼime unu, unu emeriekwala ajọ onye ahụ.
I. JỌN 2:12-14 Bible Nso (IGBOB)
Umu-ntakirim, anamedegara unu akwukwọ, n'ihi na agbagharawo unu nmehie-unu n'ihi aha-Ya. Ndi bu nna, anamedegara unu akwukwọ, n'ihi na unu amawo Onye ahu Nke di site na mbu. Umu-okorọbia, anamedegara unu akwukwọ, n'ihi na unu emeriwo ajọ onye ahu. Umu-ntakirim, edegaram unu akwukwọ, n'ihi na unu amawo Nna-ayi. Ndi bu nna, edegaram unu akwukwọ, n'ihi na unu amawo Onye ahu nke di site na mbu. Umu-okorọbia, edegaram unu akwukwọ, n'ihi na unu di ike, okwu Chineke nānọgide kwa nime unu, unu emeriwo kwa ajọ onye ahu.