I. NDI KỌRINT 2:1-5
I. NDI KỌRINT 2:1-5 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ụmụnna m, mgbe m bịakwutere unu na mbụ, ejighị m mmụta m na oke okwu megharịa unu anya banyere ihe omimi niile nke okwu Chineke. Nʼihi na ekpebiri m na naanị ihe m ga-ama nʼetiti unu bụ naanị ihe banyere Jisọs Kraịst na mkpọgbu a kpọgburu ya nʼelu obe. Abịakwutere m unu nʼọnọdụ adịghị ike, oke ụjọ na ahụ ịma jijiji. Okwu m na ihe m kwusara abịakwaghị dịka okwu ire ụtọ na nke oke mmụta, ime ka ndị mmadụ kwere, kama ha bịara nʼụzọ igosi ọrụ nke Mmụọ Nsọ na ike ya. Ka okwukwe unu ghara ịdabere nʼamamihe mmadụ, kama ka ọ dabere nʼike Chineke.
I. NDI KỌRINT 2:1-5 Bible Nso (IGBOB)
Mu onwem kwa, umu-nnam, mb͕e m'biakutere unu, abiaghm n'ọ̀kà okwu ma-ọbu n'ọ̀kà amam-ihe, nēkwusara unu àmà nke Chineke. N'ihi na ezuberem ka m'ghara imata ihe ọ bula n'etiti unu, ma-ọbughi Jisus Kraist, ka m'mata kwa Onye ahu ka onye akpọgideworo n'obe. Mu onwem nọ kwa n'etiti unu n'adighi-ike, na n'egwu, na n'oké ima-jijiji. Okwum na ihe m'kwusara abughi kwa n'okwu amam-ihe, ime ka madu kweye, kama ha bu na ngosi nke Mọ Nsọ na nke ike: ka okwukwe-unu we ghara idi n'amam-ihe madu, kama n'ike nke Chineke.