I. IHE EMERE 10:13-14 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile
I. IHE EMERE 10:13-14 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Sọl nwụrụ nʼihi ekwesighị ntụkwasị obi ya nye ONYENWE ANYị, o debeghị okwu ONYENWE ANYị, karịsịa, ọ gara na nke onye na-ajụ mmụọ ọjọọ ase, nʼihi ịjụta ya ase, ma ọ jụghị ase site nʼọnụ ONYENWE ANYị. Ọ bụ nke a mere ONYENWE ANYị ji gbuo ya, were alaeze ya nyefee Devid nwa Jesi nʼaka.
Kesaa
I. IHE EMERE 10 BIUI. IHE EMERE 10:13-14 IGBOB (Bible Nso)
Sọl we nwua n'ihi nmekpu-ya o mekpuru megide Jehova, n'ihi okwu Jehova, nke ọ nēdebegh: ọzọ kwa, n'ihi na ọ juru ase n'aka onye nwere mọ ọ nāju ihe, iji ya ju ase, ma ọ jughi Jehova ase: O we me ka ọ nwua, O we chigharia ala-eze nye Devid nwa Jesi.