M'gēkpochapusi ihe nile n'elu uwa; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. M'gēkpochapu madu na anumanu; M'gēkpochapu anu-ufe nke elu-igwe, na azù nke oké osimiri, na ihe-isu-ngọngọ nile, ha na ndi nēmebi iwu; M'gēbipu kwa madu n'elu uwa; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. M'gēseti kwa akam imegide Juda, na imegide ndi nile bi na Jerusalem; M'gēbipu kwa ndi Beal fọduru n'ebe a, na aha ndi-nchu-àjà arusi, ha na ndi-nchu-àjà nile; na ndi nākpọ isi ala nye usu ihe nile di n'elu-igwe n'elu-ulo nile; na ndi nākpọ isi ala, ndi nāṅuru Jehova iyi, ndi ji kwa Malkam aṅu iyi; na ndi si n'iso Jehova laghachi azu; na ndi nāchọghi Jehova, nājughi kwa ase Ya. Dere du n'iru Onye-nwe-ayi Jehova: n'ihi na ubọchi Jehova di nso: n'ihi na Jehova edoziwo àjà, O dowo ndi Ọ kpọrọ oriri nsọ.
Gụọ ZEFANAIA 1
Geere nke a ntị ZEFANAIA 1
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ZEFANAIA 1:2-7
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị