Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ABÙ NKE ABÙ 6:1-10

ABÙ NKE ABÙ 6:1-10 IGBOB

Òle ebe onye ihe-ya nātọ gi utọ jeworo, Gi onye mara nma n'etiti ndinyom? Òle ebe onye ihe-ya nātọ gi utọ cheworo iru, Ka ayi we soro gi chọ ya? Onye ihe-ya nātọm utọ aridaruwo ubi-ya ab͕ara ogige, rue nkpuru nile nke uda, Izù ìgwè aturu-ya n'ubi-ya nile ab͕ara ogige, na ichikọta urodi. Mu onwem bu nke onye ihe-ya nātọm utọ, onye ihe-ya nātọm utọ bu kwa nkem: Bú onye ahu nke nāzù ìgwè aturu-ya n'etiti urodi. Onye mara nma ka i bu, eyìm, dika Tiaza, I mara nma nke-uku dika Jerusalem, I bu onye anātu ujọ dika usu-ndi-agha chi ọkọlọtọ. Wepu anya-gi abua n'irum, N'ihi na ha onwe-ha akpaliwom elu. Agiri-isi-gi di ka ìgwè ewu, Nke nēdina ala n'akuku ugwu Gilead. Ezé-gi di ka ìgwè nne-aturu, Nke siworo n'isa-aru rigota; Nke ha nile chi umu abua umu abua, Ọ dighi kwa nke b͕a aka nwa n'etiti ha. Dika iberibe pomegranate ka akuku egedege-iru-gi bu N'azu ákwà-nkpuchi-gi. Ọgu eze-nwanyi atọ di, ọgu ndinyom anọ, nke bu iko, di kwa, Na umu-ab͕ọghọ nādighi ọnu-ọgugu. Nání otù ka ọ bu, bú ndurum, onye nkem nke zuru okè; Nání otù nwa nne-ya muru ka ọ bu; Onye arọputara arọputa nke nwanyi muru ya nwere ka ọ bu. Umu-ndinyom huru ya, we si na ọ bu onye ihe nāgara nke-ọma; E, ọgu eze-nwanyi atọ ahu na ọgu ndinyom anọ ahu, bú iko, ha we to ya. Ònye bu nwanyi a nke nēlepu anya dika ututu, Nke mara nma dika ọnwa, Nēnwu ka anyanwu, Onye anātu ujo dika usu-ndi-agha chi ọkọlọtọ?