Abatawom n'ubim ab͕ara ogige, nwa-nnem nwayi, nwunye ọhu nkem: Aghọrọwom myrrh nkem, ya na udam; Arachawom ub͕ub͕ọ-manu-aṅum, ya na manu-aṅum; Aṅuwom manya-vine nkem, ya na miri-ara-ehim. Rienu ihe, ndi-eyim; Ṅuanu ihe-ọṅuṅu, e, ṅujuenu afọ unu ndi ihe-unu nātọm utọ. Mu onwem nāraru ura, ma obim nēteta: Ọ bu olu nke onye ihe-ya nātọm utọ nāku aka n'uzọ, si, Megherem uzọ, nwa-nnem nwayi, eyìm, ndurum, onye nkem nke zuru okè: N'ihi na isim juputara n'igirigi, Agiri-isim juputara n'ọbubu-miri nke abali. Eyipuwom uwem; #m'gēsi aṅa yiri ya? Asawom ukwum abua; #m'gēsi aṅa me ka ha rue inyi? Onye ihe-ya nātọm utọ setipuru aka-ya tiye n'oghere uzọ, Afọm we me nkpatu n'ihi ya. Mu onwem biliri imeghere onye ihe-ya nātọm utọ uzọ; Akam abua nābusi kwa na myrrh, Nkpisi-akam nile nābusi kwa na myrrh nērù erù, N'elu nkpisi nile nke ugodi.
Gụọ ABÙ NKE ABÙ 5
Geere nke a ntị ABÙ NKE ABÙ 5
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ABÙ NKE ABÙ 5:1-5
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị