Ya were nsutu nile nke ọnu-ya sutum: N'ihi na ihu-n'anya-gi nile di nma kari manya-vine. Manu-otite-gi nile nēsì ísì ọma; Manu-otite nke nēsì ísì utọ nke awusiri awusi ka aha-gi bu; N'ihi nka ka umu-ab͕ọghọ huworo gi n'anya. Dọrọm; gi ka ayi gāb͕aso: Eze emewo ka m'ba n'ime-ulo-ya: Ayi gēteghari egwú ọṅù ṅuri kwa nime gi, Ayi gēhota ihu-n'anya-gi nile kari manya-vine: N'izi-ezi nile ka ha huworo gi n'anya. Onye oji ka m'bu, ma amaram nma, Unu umu-ndinyom Jerusalem, Dika ulo-ikwū nile nke Kida, Dika ákwà-nkwuba nile nke Solomon. Elelam anya, n'ihi na mu onwem nēji nji, N'ihi na anyanwu achawom. Umu nke nnem wesaram iwe di ọku, Ha dorom onye-nche ubi-vine-ha nile; Ma ubi-vine nkem, nke m'nwere, ka m'nēcheghi. Gosim, gi onye nkpuru-obim huworo n'anya, Ebe i nāzù ìgwè aturu-gi, ebe i nēme ka ha makpu n'etiti-ehihie: N'ihi na ọ̀ bu n'ihi gini ka m'gādi ka nwanyi ekpuchiri ekpuchi, N'akuku ìgwè aturu nile nke ndi ejikọtara gi na ha?
Gụọ ABÙ NKE ABÙ 1
Geere nke a ntị ABÙ NKE ABÙ 1
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ABÙ NKE ABÙ 1:2-7
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị