N'ihi na nka bu okwu nke nkwa, Dika oge a si di M'gābia, Sera gēnwe kwa nwa-nwoke. Ma ọ bughi nání nka; kama Rebeka kwa, mb͕e ọ tusiri ime site n'otù onye, bú Aisak nna-ayi- n'ihi na mb͕e akāmughi umu ahu, mb͕e ha akēmeghi kwa ihe ọ bula, ma ọ bu ezi ihe ma-ọbu ihe nādighi nma, ka ihe Chineke zubere dika nrọputa si di we digide, o siteghi n'ọlu, kama o sitere n'Onye nākpọ, asiri ya, Nke-okenye gēfè nke-ntà. Dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si, Jekob ka M'huru n'anya, ma Isọ ka M'kpọrọ asì.
Gini ka ayi gēkwu kwa? Ọ̀ gābu na ajọ omume di n'ebe Chineke nọ? Chineke ekwela. N'ihi na Ọ si Moses, M'gēmere onye ọ bula ebere, bú onye M'nēmere ebere, M'gēnwe kwa obi-ebere n'aru onye ọ bula, bú onye M'gēnwe obi-ebere n'aru-ya. Ya mere otú a ọ bughi nke onye nāchọ, ọ bughi kwa nke onye nāb͕a ọsọ, kama ọ bu nke Onye ahu Nke nēme ebere, bú Chineke. N'ihi na ihe edeworo n'akwukwọ nsọ nāsi Fero, Ọ bu n'ihi otù ihe a ka M'mere ka i bilie, ka M'we gosi ikem nime gi, ka ewe kwusa kwa aham n'uwa nile. Ya mere otú a ọ bu onye Ọ nāchọ ka Ọ nēmere ebere, ọ bu kwa onye Ọ nāchọ ka ọ nēme ka o nwe obi-etili.
Ya mere i gāsim, Gini mere Ọ nọ nāta uta? N'ihi na ọ̀ bu onye nēguzogide ihe O zubere? Ajuju kwesikariri iju, gi madu, bu, Gì onwe-gi bu onye, nke nāza Chineke okwu imegide Ya? Ọ̀ gābu na ihe akpuworo gāsi onye kpuru ya, Gini mere i kpurum otú a? Ma-ọbu ọkpu-ite, ò nweghi ike n'ebe urọ di, isite n'otù ọkpukpu-urọ ahu o doziri me nka ka ọ buru ihe gānara nsọpuru, me kwa nke-ọzọ ka ọ buru ihe agēme ihe-ihere?