Ma ọ bughi dika agāsi na okwu Chineke adawo n'ala. N'ihi na ndi si n'Israel puta, ọ bughi ndi ahu nile bu Israel: ọ bughi kwa ha nile bu umu, n'ihi na ha bu nkpuru Abraham: kama, Nime Aisak ka agākpọ nkpuru-gi aha. Nke ahu bu, umu nke anu-aru-ya, ọ bughi ndia bu umu Chineke; kama umu nke nkwa ahu ka anāgu na nkpuru. N'ihi na nka bu okwu nke nkwa, Dika oge a si di M'gābia, Sera gēnwe kwa nwa-nwoke. Ma ọ bughi nání nka; kama Rebeka kwa, mb͕e ọ tusiri ime site n'otù onye, bú Aisak nna-ayi- n'ihi na mb͕e akāmughi umu ahu, mb͕e ha akēmeghi kwa ihe ọ bula, ma ọ bu ezi ihe ma-ọbu ihe nādighi nma, ka ihe Chineke zubere dika nrọputa si di we digide, o siteghi n'ọlu, kama o sitere n'Onye nākpọ, asiri ya, Nke-okenye gēfè nke-ntà. Dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si, Jekob ka M'huru n'anya, ma Isọ ka M'kpọrọ asì.
Gini ka ayi gēkwu kwa? Ọ̀ gābu na ajọ omume di n'ebe Chineke nọ? Chineke ekwela. N'ihi na Ọ si Moses, M'gēmere onye ọ bula ebere, bú onye M'nēmere ebere, M'gēnwe kwa obi-ebere n'aru onye ọ bula, bú onye M'gēnwe obi-ebere n'aru-ya. Ya mere otú a ọ bughi nke onye nāchọ, ọ bughi kwa nke onye nāb͕a ọsọ, kama ọ bu nke Onye ahu Nke nēme ebere, bú Chineke. N'ihi na ihe edeworo n'akwukwọ nsọ nāsi Fero, Ọ bu n'ihi otù ihe a ka M'mere ka i bilie, ka M'we gosi ikem nime gi, ka ewe kwusa kwa aham n'uwa nile. Ya mere otú a ọ bu onye Ọ nāchọ ka Ọ nēmere ebere, ọ bu kwa onye Ọ nāchọ ka ọ nēme ka o nwe obi-etili.