NDI ROM 8:8-10
NDI ROM 8:8-10 IGBOB
ndi nke nọ n'anu-aru apughi kwa itọ Chineke utọ. Ma unu onwe-unu anọghi n'anu-aru, kama unu nọ nime Mọ Nsọ, ma ọ buru na ọbu ezie na Mọ nke Chineke nēbi nime unu. Ma ọ buru na onye ọ bula enweghi Mọ nke Kraist, onye ahu abughi nke Ya. Ma ọ buru na Kraist nọ nime unu, aru-unu bu ihe nwuru anwu n'ihi nmehie n'ezie; ma Mọ Nsọ bu ndu n'ihi ezi omume.

