Ùnu amataghi na onye unu nēche onwe-unu n'iru ya ka unu buru ndi-orù iṅa ya nti, unu bu ndi-orù nke onye ahu unu nāṅa nti ya; ma-ọbu nke nmehie nēweta ọnwu, ma-ọ̀bu nke iṅa-nti nēweta ezi omume? Ma ekele diri Chineke, na unu buri ndi-orù nke nmehie, ma unu sitere n'obi-unu ṅa nti ihe-atù nke ozizi ahu nke arara unu nye n'aka-ya; ebe eme-kwa-ra ka unu pua na nmehie nwere onwe-unu, unu ghọrọ ndi-orù nke ezi omume. Anamekwu dika madu n'ihi adighi-ike nke anu-aru-unu: n'ihi na dika unu chere ihe nile di unu n'aru n'iru adighi-ọcha na n'iru imebi-iwu nēdubà n'imebi-iwu ka unu buru ndi-orù-ha, otú a chenu ihe nile di unu n'aru n'iru ezi omume ub͕u a, bú nke nēdubà n'ido-nsọ, ka unu buru ndi-orù-ya. N'ihi na mb͕e unu bu ndi-orù nke nmehie, unu nwere onwe-unu n'ebe ezi omume di. Ọ̀ bu nkpuru gini kwa ka unu nwere n'oge ahu n'ihe nile ahu nke ihere ha nēme unu ub͕u a? n'ihi na ọgwugwu ihe nile ahu bu ọnwu. Ma ub͕u a ebe unu pusiri na nmehie nwere onwe-unu, ghọ kwa ndi-orù nke Chineke, unu nwere nkpuru-unu nēweta ido-nsọ, unu nwe-kwa-ra ndu ebighi-ebi dika ọgwugwu-ya.
Gụọ NDI ROM 6
Geere nke a ntị NDI ROM 6
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: NDI ROM 6:16-22
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị