NDI ROM 5:18-19
NDI ROM 5:18-19 IGBOB
Ya mere otú a, dika ikpé ahu sitere n'otù ndahie bia rue madu nile iwetara ha amam-ikpe; ọbuná otú a ka onyinye-amara ahu sitere n'otù ọlu ezi omume bia rue madu nile igu ha na ndi ezi omume ka ha nata ndu. N'ihi na dika edoro ọra madu na ndi-nmehie site n'aṅaghi-nti nke otù madu ahu, ọbuná otú a ka agēdo ọra madu na ndi ezi omume site n'iṅa-nti nke otù Onye ahu.


