NDI ROM 13:7-10
NDI ROM 13:7-10 IGBOB
Nākwughachinu madu nile ihe nile unu ji ha n'ugwọ: tunu ùtú nye onye unu ji ugwọ ùtú; tunu ùtú-ahia nye onye unu ji ugwọ ùtú-ahia; tuanu egwu onye unu ji ugwọ egwu; sọpurunu onye unu ji ugwọ nsọpuru. Unu ejila onye ọ bula ugwọ ọ bula, ma-ọbughi ihurita onwe-unu n'anya: n'ihi na onye nāhu madu-ibe-ya n'anya edebezuwo iwu. N'ihi na okwu a, Akwala iko, Eb͕ula madu, Ezula ori, Agu ihe ọjọ agula gi, ọ buru kwa na ihe ọ bula ọzọ di enyere n'iwu, achikọtara ya n'okwu a, bú, Hu onye-ab͕ata-obi-gi n'anya dika onwe-gi. Ihu-n'anya adighi-alu ọlu ọjọ n'ebe onye-ab͕ata-obi-ya nọ: ya mere ihu-n'anya bu idebezu iwu.

