Kama ọ̀ bu gini ka ọ nēkwu? Okwu ahu di gi nso, n'ọnu-gi, na n'obi-gi: nke ahu bu, okwu okwukwe, nke ayi nēkwusa: na ọ buru na i gēwere ọnu-gi kwuputa Jisus na Ọ bu Onye-nwe-ayi, ọ buru kwa na i gēwere obi-gi kwere na Chineke mere ka O si na ndi nwuru anwu bilie, agāzọputa gí: n'ihi na anēji obi kwere rue ezi omume; anēji kwa ọnu kwuputa rue nzọputa. N'ihi na ihe edeworo n'akwukwọ nsọ nāsi, Onye ọ bula nke kwere na Ya, agaghi-eme ka ihere me ya. N'ihi na ọ dighi ihe di iche n'etiti onye-Ju na onye-Grik: n'ihi na otù Onye-nwe-ayi ahu bu Onye-nwe ọra madu, buru kwa Onye nwere àkù ri nne inye ndi nile nākpọku Ya: n'ihi na, Onye ọ bula nke gākpọku aha Onye-nwe-ayi, agāzọputa ya. Hà gēsi kwa aṅa kpọku Onye ahu ha akēkweghi na Ya? ma hà gēsi aṅa kwere n'Onye ahu ha akānughi okwu-Ya? ma hà gēsi aṅa nu ma onye nēkwusa anọghi? ma hà gēsi aṅa kwusa, ma ọ buru na ezigaghi ha? dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si, Le, ka ha si ma nma nke-uku, bú ukwu ndi nēzisa ozi ọma nke ezi ihe!
Gụọ NDI ROM 10
Geere nke a ntị NDI ROM 10
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: NDI ROM 10:8-15
5 Ụbọchị
Echiche Akwụkwọ Nsọ maka Ndị Rom 10:6-10: Mmesi obi ike nke ọnụnọ Chineke na-adịgide adịgide mgbe niile, ịdị nso nke okwu Chineke, ya na oku iji kwupụta Jizọs n'ezie site n'ịkpọsa ọrụ nke ya ọ rụchaworo nye ụwa site n'okwu na omume anyị.
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị