Mbu, anamekele Chinekem ekele site na Jisus Kraist bayere unu nile, na anēkwusa okwukwe-unu n'uwa dum. N'ihi na Chineke, Onye m'nēkpere nime mọm n'ozi ọma nke Ọkpara-Ya, bu Onye-àmàm, otú m'nārapughi aka n'ihota unu, nāriọ aririọ mb͕e nile n'ekperem nile, ọ buru na, ma eleghi anya, ub͕u a n'oge a ezi uzọ gādirim ibiakute unu, n'ihe Chineke nāchọ. N'ihi na ihu unu anya nāgusim ike, ka m'kwe ka unu keta onyinye-amara ufọdu nke Mọ Nsọ, ka ewe me ka unu guzosie ike; nke ahu bu, ka ewe kasie mu na unu obi n'etiti unu, site n'okwukwe ayi kwekọrọ, ma nke unu ma nke mu onwem. Ma achọghi m ka unu ghara imara, umu-nnam, na ọtutu mb͕e m'zubere ibiakute unu (eb͕ochi-kwa-ram ibia rue ub͕u a), ka m'we nwe kwa nkpuru ufọdu n'etiti unu, dika ọ di kwa n'etiti ndi mba ọzọ fọduru.
Gụọ NDI ROM 1
Geere nke a ntị NDI ROM 1
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: NDI ROM 1:8-13
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị