M'we hu, ma le, Nwa-aturu ahu ka Ọ nēguzo n'ugwu Zaion, Ya na ọgu nnù iri na ọgu nnù asatọ, bú ndi edeworo aha-Ya na aha Nna-Ya n'egedege-iru-ha. M'we nu olu ka ọ nēsi n'elu-igwe dà, dika olu ọtutu miri, di kwa ka olu oke éb͕è-elu-igwe: olu ahu m'nuru di kwa ka olu ndi nākpọ ubọ-akwara mb͕e ha nēwere ubọ-akwara-ha nākpọ: ha we nābù dika agāsi na ọ bu abù ọhu n'iru oche-eze ahu, na n'iru ihe anọ ahu nke di ndu na ndi-okenye ahu: ọ dighi kwa onye ọ bula puru imuta abù ahu ma-ọbughi ọgu nnù iri na ọgu nnù asatọ ahu, bú ndi ab͕atarari n'uwa. Ndia bu ndi nēmerughi onwe-ha n'aru ndinyom; n'ihi na ha di ọcha ka umu-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke. Ndia bu ndi nēso Nwa-aturu ahu ebe ọ bula Ọ nēje. Ndia ka ab͕atara n'etiti madu, iburu Chineke na Nwa-aturu ahu nkpuru mbu. Ọ dighi kwa ugha ọ bula ahuru n'ọnu-ha: ha bu ndi anātaghi uta. M'we hu mọ-ozi ọzọ ka ọ nēfe n'etiti elu-igwe, nēnwe ozi ọma ebighi-ebi izisara ndi nānọdu n'elu uwa, bú mba nile ọ bula na ebo nile ọ bula na asusu nile ọ bula na ndi nile ọ bula; ọ nēwere kwa oké olu si, Tuanu egwu Chineke, nye kwa Ya otuto; n'ihi na oge hour nke ikpé-Ya abiawo: kpọ-kwa-nu isi ala nye Ya, bú Onye kère elu-igwe na ala, oké osimiri na isi-iyi nile nke miri nile.
Gụọ NKPUGHE 14
Geere nke a ntị NKPUGHE 14
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: NKPUGHE 14:1-7
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị