Bùkuenu Jehova abù ọhu; N'ihi na Ọ luwo oké ọlu di iche iche; Aka-nri-Ya na ogwe-aka-Ya di nsọ enyewo Ya nzọputa. Jehova emewo ka amara nzọputa-Ya: N'anya mba nile ka O kpugheworo ezi omume-Ya. O chetawo ebere-Ya na ikwesi-ntukwasi-obi-Ya n'ebe ulo Israel di: Nsọtu nile nke uwa ahuwo nzọputa Chineke-ayi. Tikusienu Jehova nkpu ọṅù ike, uwa nile: Tiwanu nkpu, tienu nkpu ọṅù, bùanu abù ọma. Werenu ubọ-akwara bùkue Jehova abù ọma; Werenu ubọ-akwara na olu abù ọma. Chirinu opì na olu opì-ike Tisie nkpu ọṅù ike n'iru Eze, bù Jehova. Ka oké osimiri bib͕ọ, na ùjú-ya; Elu-uwa dum madu bi, na ndi bi nime ya; Ka osimiri nile kua aka-ha; Ka ugwu tie nkpu ọṅù n'otù; N'iru Jehova, n'ihi na Ọ biawo ikpe uwa ikpe: Ọ gēwere ezi omume kpe elu-uwa dum madu bi ikpe, Ọ gēwere kwa izi-ezi kpe ndi nile di iche iche.
Gụọ ABÙ ỌMA 98
Geere nke a ntị ABÙ ỌMA 98
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ABÙ ỌMA 98:1-9
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị