Jehova bu eze; ka uwa tegharia egwu ọṅù; Ka ala bara uba nke di oké osimiri buruburu ṅuria. Igwe-oji na oké ọchichiri di Ya buruburu: Ezi omume na ikpé ziri ezi bu ọnọdu guzosiri ike nke oche-eze-Ya. Ọku nāga n'iru Ya, Nēsure kwa ndi-nkpab͕u-Ya buruburu. Àmùmà-Ya nile nyere elu-uwa dum madu bi ìhè: Uwa huru ya, o we gbue ya nb͕u. Ugwu nile b͕azepuru dika wax n'iru Jehova, N'iru Onye-nwe uwa nile. Elu-igwe gosiri ezi omume-Ya, Ndi nile di iche iche hu-kwa-ra ebube-Ya. Ka ihere me ndi nile ndi nēfè arusi apiri api òfùfè, Ndi nānya isi n'ihe-efu di iche iche: Kpọnu isi ala nya Ya, unu chi nile. Zaion nuru, we ṅuria, Umu-ndinyom Juda we tegharia egwu ọǹù; N'ihi ikpé-Gi nile, Jehova. N'ihi na Gi onwe-gi, Jehova, bú Onye kachasi ihe nile elu n'elu uwa nile: Emewo ka I di elu nke-uku n'elu chi nile. Unu ndi nāhu Jehova n'anya, kpọnu ihe ọjọ asì: Ọ nēdebe nkpuru-obi ndi-ebere-Ya; Ọ nānaputa ha n'aka ndi nēmebi iwu. Aghaworo onye ezi omume ìhè dika nkpuru, Aghawo-kwa-ra ndi ziri ezi n'obi ọṅù. Ṅurianu na Jehova, unu ndi ezi omume; Kele-kwa-nu ihe-ncheta-Ya di nsọ.
Gụọ ABÙ ỌMA 97
Geere nke a ntị ABÙ ỌMA 97
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ABÙ ỌMA 97:1-12
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị