Onye-nwe-ayi, ebe-obibi ka Gi onwe-gi buworo ayi N'ọb͕ọ nile. Tutu amuputa ugwu, Ma-ọbu tutu I kpua uwa na elu-uwa dum madu bi, Ọbuná site na mb͕e ebighi-ebi rue mb͕e ebighi-ebi, Gi onwe-gi bu Chineke. I nēme ka madu laghachi n'ájá; I we si, Laghachinu, umu madu. N'ihi na nnù arọ abua na ọgu iri n'anya-Gi Di ka nnyahuru mb͕e ọ nāga, Na dika otù nche n'abali. I wuchapuwo ha dika oké miri-ozuzo; nání ura ka ha bu: N'ututu ha di ka ahihia nētó etó. N'ututu ọ nāb͕awa uzari, nētó kwa etó; N'anyasi ka anēbipu ya, o we kpọnwua. N'ihi na emewo ka ayi gwusia n'iwe-Gi, Ọ bu kwa n'ọnuma-Gi ka emeworo ka ayi ma jijiji. I dowo ajọ omume nile ayi n'iru Gi, I dowo nmehie-ayi zoro ezo n'ìhè nke iru-Gi. N'ihi na ubọchi-ayi nile agawo nime nrubiga-ókè nke iwe-Gi: Ayi emewo ka arọ nile ayi gwusia dika otù nze-ume. Ubọchi arọ nile ayi di ọgu arọ atọ na iri; Ma ọ buru na ha esite n'idi-ike-ayi rue ọgu arọ anọ, Otú ọ di, nganga-ha bu nání idọb͕u-onwe-ha-n'ọlu na ajọ ihe; N'ihi na ọ b͕apuwo ọsọsọ, ayi we fela dika nnunu.
Gụọ ABÙ ỌMA 90
Geere nke a ntị ABÙ ỌMA 90
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ABÙ ỌMA 90:1-10
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị