Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ABÙ ỌMA 89:19-37

ABÙ ỌMA 89:19-37 IGBOB

Mb͕e ahu I gwara ndi-ebere-Gi okwu n'ọhù, Si, Atukwasiwom iye-aka n'aru dike; Emewom ka otù onye arọputaworo n'etiti ndim di elu. Achọtawom Devid, bú orùm; Ewerewom manu nsọm te ya: Onye akam gēguzosi ike n'ebe ọ nọ; Ọzọ, ogwe-akam gāb͕a ya ume. Onye-iro agaghi-abiakwasi ya na mberede; Ọzọ, nwa nke ajọ omume agaghi-eweda ya n'ala. M'gētipia kwa ndi nākpab͕u ya n'iru ya, Ti kwa ndi nākpọ ya asì ihe. Ma ikwesi-ntukwasi-obim na eberem gādi n'aru ya: Ọ bu kwa n'aham ka mpi-ya gādi elu. M'gēdo kwa aka-ya n'oké osimiri, Do kwa aka-nri-ya n'osimiri nile. Onye ahu gākpọm, si, Nnam ka I bu, Chinekem, na oké nkume nke nzọputam. Ọzọ, Mu onwem gēme ya ọkparam, Onye kachasi ihe nile elu n'ebe ndi-eze nke uwa nọ. Rue mb͕e ebighi-ebi ka M'gēdebere ya eberem, Ọb͕ub͕a-ndum gēkwesi-kwa-ra ya ntukwasi-obi. M'gēme kwa ka nkpuru-ya dirue mb͕e ebighi-ebi, Me kwa ka oche-eze-ya di ka ubọchi nile nke elu-igwe. Ọ buru na umu-ya arapu iwum, Ghara kwa ijeghari n'ikpém nile; Ọ buru na ha eme ka ukpurum nile ghara idi nsọ, Ọ buru kwa na ha edebeghi ihe nile M'nyere n'iwu; M'gēwere kwa nkpa-n'aka leta njehie-ha, Were kwa ihe-otiti leta ajọ omume-ha. Ma M'gaghi-esi n'ebe ọ nọ mebie eberem, M'gaghi-ekwu kwa okwu-ugha megide ikwesi-ntukwasi-obim. M'gagh-eme ka ọb͕ub͕a-ndum ghara idi nsọ, Ọzọ, M'gagh-agbanwe ihe siworo n'eb͕ub͕ere-ọnum abua puta. Otù ub͕ò ka M'jiworo idi-nsọm ṅua iyi; M'gaghi-agwa Devid okwu-ugha ma-ọli; Nkpuru-ya gādiru mb͕e ebighi-ebi, Oche-eze-ya gādi kwa ka anyanwu n'irum. Dika ọnwa ka o gēguzosi ike rue mb͕e ebighi-ebi; Ọzọ, Onye-àmà Nke nọ na mbara-ígwé kwesiri ntukwasi-obi. Selah