Chineke ekwuwo okwu n'di-nsọ-Ya; ka m'ṅuria ọṅu-agha: M'gēkè Shekem, tù kwa ndagwurugwu Sukot. Mu nwe Gilead, ọ bu kwa mu nwe Manase; Efraim bu kwa ebe siri ike nke isim; Juda bu nkpa-n'aka-ezem. Moab bu ite ọsisa-arum; N'elu Edom ka m'gātu akpukpọ-ukwum: Filistia, tie nkpu n'ihim. Ònye gēdubàm nke-ọma n'obodo ewusiri ike? Ònye duruworom rue Edom? Ọ̀ bughi Gi onwe-gi, Chineke, juworo ayi aju? I dighi-apu kwa ije agha n'etiti usu nile nke ndi-agha ayi, Chineke. Yere ayi aka ka ayi pua n'aka onye-nkpab͕u: N'ihi na ihe-efu ka nzọputa madu bu. Nime Chineke ayi ga-eme ihe dìnkpà: Ọ bu kwa Ya onwe-ya gāzọda ndi nākpab͕u ayi
Gụọ ABÙ ỌMA 60
Geere nke a ntị ABÙ ỌMA 60
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ABÙ ỌMA 60:6-12
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị