Ma mu onwem, n'uba nke ebere-Gi ka m'gābà n'ulo-Gi: M'gākpọ isi ala n'ebe ulo uku nsọ Gi di n'egwu-Gi. Jehova, dubem n'ezi omume-Gi n'ihi ndi nēchem anwu; Me ka uzọ-Gi zie ezi n'irum. N'ihi na ọ dighi ihe nke nēguzosi ike di n'ọnu-ya; Ime-ha bu ila-n'iyì nile: Ílì ghere oghe ka akpiri-ha bu; Ha nēkwu okwu ire-utọ. Ma ha ikpe, Chineke; Ka ha da ada site na ndum-ọdu nile ha: N'uba nke njehie nile ha nupu ha; N'ihi na ha anupuwo isi imegide Gi. Ma ka ndi nile ndi nābabà nime Gi ṅuria, Ka ha tie nkpu ọṅù rue mb͕e ebighi-ebi, n'ihi na I nēkpuchi ha ǹdò: Ọzọ, ka obi nke ndi nāhu aha-Gi n'anya tọ ha utọ nime Gi. N'ihi na Gi onwe-gi nāgọzi onye ezi omume; Jehova, I ji otú ihe-ya si atọ Gi utọ b͕a ya buruburu dika ọta uku.
Gụọ ABÙ ỌMA 5
Geere nke a ntị ABÙ ỌMA 5
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ABÙ ỌMA 5:7-12
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị