Chineke buru ayi ebe-nb͕abà na ike, O mewo ka achọta Ya n'iye aka nke-uku na nkpab͕u nile. N'ihi nka ayi agaghi-atu egwu mb͕e uwa nāb͕anwe, Ma-ọbu mb͕e anēwezuga ugwu nile n'ọnọdu-ha ga n'etiti oké osimiri; Mb͕e miri-ya nāb͕a aghara nāsu kwa ufufu, Mb͕e ugwu nile nēme nkpatu site na nbili-elu ya. Selah Otù osimiri di, miri-iyi-ya nile nēme ka obodo Chineke ṅuria ọṅu, Bú ebe nsọ nke ebe-obibi nile nke Onye kachasi ihe nile elu. Chineke nọ n'etiti ya; agaghi-ewezuga ya n'ọnọdu-ya: Chineke gēyere ya aka mb͕e chi bọrọ. Mba nile ozo b͕ara aghara, ewezugara ala-eze nọnọdu-ha: O mere ka olu-Ya da, uwa nabaze. Jehova nke usu nile nke ndi-agha nọyere ayi; Chineke nke Jekob buru ayi ulo-elu. Selah Jenu, hu ọlu nile nke Jehova, Onye doworo ihe-iju-anya di iche iche n'uwa, Nēme ka agha nile kwusi rue nsọtu uwa; Ọ nāb͕aji uta, b͕upia kwa ube; Ọ nēsure ub͕ọ-ala nile n'oku. Ranu aka, mara kwa na Mu onwem bu Chineke: Agēbulim n'etiti mba nile, agēbulim n'uwa. Jehova nke usu nile nke ndi-agha nọyere ayi; Chineke nke Jekob buru ayi ulo-elu. Selah
Gụọ ABÙ ỌMA 46
Geere nke a ntị ABÙ ỌMA 46
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ABÙ ỌMA 46:1-11
5 Days
In the midst of uncertainty, God is certain! Join David Villa in his latest plan as he looks past uncertainty and negativity in order to reach something greater.
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị