Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ABÙ ỌMA 40:1-17

ABÙ ỌMA 40:1-17 IGBOB

Elesirim anya Jehova ike; Ọ we tọrọm nti-Ya n'ala, nu ntikum. Ọ we me ka m'si n'olùlù nbibi, n'apiti nke ala urọ, rigoputa; Ọ we me ka ukwum abua guzo n'elu nkume di elu, Ọ nēme ka nzọ-ukwum nile guzosie ike. Ọ we tiye abù ọhu n'ọnum, bú otuto diri Chineke-ayi: Ọtutu madu gāhu ya, tua egwu, We tukwasi Jehova obi. Onye ihe nāgara nke-ọma ka ọ bu, bú nwoke nke meworo Jehova ka Ọ buru ihe-ntukwasi-obi-ya, Ọ cheghi kwa ndi-nganga iru, ma-ọbu ndi nējehi n'uzọ okwu-ugha. Ọtutu ihe ka Gi onwe-gi meworo, Jehova, bú Chinekem, bú oké ọlu-Gi nile, Na èchìchè-Gi nile n'ebe ayi nọ: Apughi idoro Gi ha n'usoro; Asi na agamegosi kwu kwa okwu bayere ha, Ha kariri igu-ọnu. Àjà na onyinye-inata-iru-ọma adighi-atọ Gi utọ; Nti abua ka I ràpúworom: Ọ bughi àjà-nsure-ọku na àjà-nmehie ka I chọworo. Mb͕e ahu ka M'siri, Le, abiawom; N'akwukwọ-npiakọta ka edeworo ihe bayerem: Ime ihe di Gi utọ atọwom utọ, Chineke; Iwu-Gi di kwa nime obim. Ezisawom ozi ọma nke ezi omume nime nkpọkọta-Gi bara uba; Le, adighm-eb͕ochi eb͕ub͕ere-ọnum abua, Jehova, Gi onwe-gi amawo. Ekpuchighm ezi omume-Gi nime obim; Ekwusawom ikwesi-ntukwasi-obi-Gi na nzọputa-Gi: Ezonarighm nkpọkọta-Gi bara uba ebere-Gi na ezi-okwu-Gi Gi onwe-gi, Jehova, ebochilaram obi-ebere-Gi nile: Ka ebere-Gi na ezi-okwu-Gi nēchezim mb͕e nile. N'ihi na ihe ọjọ nādighi ọnu-ọgugu ab͕awom buruburu, Ajọ omumem nile eruwom aru, apughkwam ihu uzọ; Ha kariri agiri-isi nile nke isim n'uba, obim arapuwokwam. Jehova, ka ọ tọ Gi inaputam: Jehova, bia ọsọsọ iyerem aka. Ka ihere me ha, ka ha nile nwe kwa iru-ihere n'otù, Bú ndi nāchọ nkpuru-obim ikpochapu ya: Ka ha laghachi azu, ka etiye kwa ha n'ọnọdu-ihere, Bú ndi ihe ọjọ dakwasirim nātọ utọ. Ka ha tọb͕ọrọ n'efu n'ihi ihere-ha, Bú ndi nāsim, Ehe, ehe. Ka obi tọ ndi nile nke nāchọ Gi utọ, ka ha ṅuri kwa ọṅu nime Gi: Ka ndi nāhu nzọputa-Gi n'anya nāsi mb͕e nile, Ka Jehova di uku. Ma mu onwem bu onye ewedara n'ala na ob͕eye; Ma Onye-nwe-ayi nēchèrem èchìchè: Onye-iye-akam na Onye nēme ka m'b͕apu ka I bu; Chimekem, anọla ọdù.