Onye-nwe-ayi, #mb͕e ole ka I ganēle anya?
Si na ntikpọ nile ha weghachi nkpuru-obim,
Si n'aka umu-ọdum weghachi nkpuru-obi m'nwere nání ya.
M'gēkele Gi n'etiti nkpọkọta bara uba:
N'etiti otù ndi nwere ume ka m'gēto Gi.
Ekwela ka ndi-irom, bú ndi-okwu-ugha, ṅuam ọǹu:
Ekwela ka ndi nākpọm asì mb͕e m'nēmeghi ihe b͕ue iku-anya.
N'ihi na ọ bughi okwu udo ka ha nēkwu:
Ma ha nēchèputa okwu di iche iche nke aghughọ nile imegide ndi nọ jū n'ala.
Ha we me ka ọnu-ha sa mbara imegidem;
Ha siri, Ehe, ehe, anya-ayi ahuwo ya.
I huwo ya, Jehova; ab͕ala nkiti:
Onye-nwe-ayi, anọlam n'ebe di anya.
Kpọte Onwe-gi, kpetara ikpe m,
Chinekem na Onye-nwem, tetara okwu-ikpem.
Kpem ikpe dika ezi omume-Gi si di, Jehova, bú Chinekem;
Ekwe-kwa-la ka ha ǹuam ọǹu.
Ekwela ka ha si n'obi-ha, Ehe, nka bu ọchichọ nkpuru-obi-ayi:
Ekwela ka ha si, Ayi elodawo ya.
Ka ihere me ha, ka ha nile nwe kwa iru-ihere n'otù, bú ndi na-aṅuri ọǹu n'ihe ọjọ nādakwasim:
Ka ha yiri ihere na ọnọdu-ihere dika uwe, bú ndi nēme onwe-ha ka ha di uku imegidem.
Ka ha tie nkpu ọṅù, ṅuri kwa ọṅu, bú ndi ezi omumem nātọ utọ:
Ka ha nāsi kwa mb͕e nile, Jehova di uku, Onye udo orù-Ya nātọ Ya utọ.
Irem ganēkwu okwu, dika onye nātughari uche, bayere ezi omume-Gi,
Baye-kwa-ra otuto-Gi ogologo ubọchi nile.