ABÙ ỌMA 34:8-14
ABÙ ỌMA 34:8-14 IGBOB
Detunu ire, hu na Jehova di nma: Onye ihe nāgara nke-ọma ka ọ bu, bú nwoke nke nāb͕abà nime Ya. Tuanu egwu Jehova, unu ndi nsọ Ya: N'ihi na ọ dighi ihe nākọ ndi nātu egwu Ya. Nkpà akpawo umu-ọdum, agu aguwo kwa ha: Ma ndi nāchọ Jehova, ọ dighi ezi ihe ọ bula gākọ ha. Bianu, umum, gem nti: Egwu Jehova ka m'gēzi unu. Ònye bu nwoke ahu nke ndu nātọ ya utọ, Nke nāhu ubọchi nile nke ndu n'anya, ka o we hu ọdi-nma? Chezi ire-gi ka ọ ghara ikwu ihe ọjọ, chezi kwa eb͕ub͕ere-ọnu-gi ka ha ghara ikwu okwu aghughọ. Si n'ihe ọjọ wezuga onwe-gi, me ezi ihe; Nāchọsi udo ike, b͕aso kwa ya.



