ABÙ ỌMA 3:1-5
ABÙ ỌMA 3:1-5 IGBOB
Jehova, le otú ndi nākpab͕um bara uba! Ọtutu madu nēbili imegidem. Ọtutu madu nēkwu okwu bayere nkpuru-obim, si, Ọ dighi nzọputa diri ya nime Chineke. Ma Gi onwe-gi, Jehova, bu ọta buruburum, Na nsọpurum, na onye nēbuli isim elu. Ejim olum kpọkue Jehova, O we zam site n'ugwu nsọ Ya. Mu onwem dinara ala, raru ura; Etetaram; n'ihi na Jehova nākwagidem.


