Chinekem, Chinekem, n'ìhi gini ka I rapurum?
N'ìhi gini ka I nọ m n'ebe di nzọputam na okwu nile nke ọb͕ub͕ọ-ujam anya?
Chinekem, anamakpọ òkù n'ehihie, ma I dighi-aza;
N'abali kwa, ma ọ dighi inọ-jū m'nwere.
Ma Gi onwe-gi di nsọ,
Gi Onye nānọkwasi n'otuto nile nke Israel dika oche-eze.
Na Gi ka nna-ayi-hà tukwasiri obi:
Ha tukwasiri obi, I we me ka ha b͕apu.
Gi ka ha tikuru, eme-kwa-ra ka ha wepuga onwe-ha:
Na Gi ka ha tukwasiri obi, ihere emeghi kwa ha.
Ma mu onwem bu idide, ọ bughi kwa madu ka m'bu;
Abum ihe-ita-uta nke mmadu, na onye ndim neleda anya.
Ndi nile ndi nāhum nāchìm ọchi:
Ha na-enu ọnu, fufè isi, si,
Turu onwe-gi rue Jehova aru; Ya me ka ọ b͕apu:
Ya naputa ya, n'ihi na ihe-ya atọwo Ya utọ.
Otú ọ di, Gi onwe-gi bu onye meworo ka m'waputa n'afọ nnem:
I nēme ka m'tukwasi obi mb͕e m'nọ nara nnem.
Na Gi ka atukwasirim site n'àkpà-nwa:
Site n'afọ nnem ka Gi onwe-gi bu Chinekem.
Anọlam n'ebe dí anya; n'ihi na nkpab͕u di nso;
N'ihi na ọ dighi onye nēyerem aka.
Ọtutu oke-ehi dim buruburu:
Oke-ehi di ike nke Beshan ab͕awom buruburu.
Ha asaghepuwo ọnu-ha n'arum,
Dika ọdum nke nādọb͕u anu, nke nāb͕ọ kwa uja.
Dika miri ka awusiworom,
Ọkpukpum nile ekesawo onwe-ha:
Obim aghọwo ihe dika wax;
Ọ lọwo miri n'etiti afọm.
Ikem akpọwo nku di ka osisi;
Irem nārapara kwa n'ab͕am;
Ọ bu kwa n'ájá ọnwu ka I nātọb͕ọm.
N'ihi na nkita dim buruburu:
Nzukọ ndi nēme ihe ọjọ ab͕awom buruburu;
Ha nādupú akam abua na ukwum abua.
Anamagu ọkpukpum nile ọnu;
Ndi ahu nēlegide nēlekwam anya:
Ha nēkère onwe-ha uwem,
N'elu ihe m'nēyi n'aru ka ha nēfe kwa nzà.
Ma Gi onwe-gi, Jehova, anọla n'ebe di anya:
Gi ikem, bia ọsọsọ iyerem aka.
Naputa nkpuru-obim na mma-agha;
Naputa nkpuru-obi m'nwere nání ya náka nkita.
Zọputam n'ọnu ọdum;
Ọzọ, site na mpi atu ka I zaworom.
Agamakọrọ umu-nnem aha-Gi:
N'etiti nkpọkọta-Gi ka m'gēto Gi.
Ndi nātu egwu Jehova, tonu Ya;
Unu nile, bú nkpuru nke Jekob, sọpurunu Ya;
Tu-kwa-nu ujọ Ya, unu nkpuru nile nke Israel.
N'ihi na O ledaghi nweda-n'ala nke onye ewedara n'ala anya, Ọ kpọghi kwa ya ihe-árú;
O zonarighi kwa ya iru-Ya;
Ma mb͕e o tikuru Ya, Ọ nuru olu-ya.