Mb͕e ahu Ọ gāgwa ha okwu n'iwe-Ya, Ọ bu kwa n'iwe-Ya di ọku ka Ọ gēme ka ha ma jijiji: Ma Mu onwem emewo ka ezem guzosie ike N'elu Zaion, bú ugwu nsọm. M'gākọ akukọ bayere ukpuru: Jeohva sirim, Ọkparam ka gi onwe-gi bu; Mu onwem amuwo gi ta. Riọm, na agamenye gi mba nile ka ha buru ihe-nketa-gi, Na nsọtu uwa ka ha buru ihe-onwunwe-gi. I gēji nkpa-n'aka ígwè tijisi ha; Dika ihe ọkpu-ite kpuru ka agātupia ha. Ma ub͕u a, ndi-eze, nwenu uche: Ka adọ unu aka na nti, ndi-ikpe nke uwa. Werenu egwu fè Jehova òfùfè, Were-kwa-nu ọma-jijiji tegharia egwú ọṅù. Sutunu onye arọputaworo ọnu, ka ọ ghara iwe iwe, unu we la n'iyì n'uzo, N'ihi na iwe-ya gēre ọku na mb͕e ntà. Ndi ihe nāgara nke-ọma ka ha bu, bú ndi nile nāb͕abà nime ya.
Gụọ ABÙ ỌMA 2
Geere nke a ntị ABÙ ỌMA 2
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ABÙ ỌMA 2:5-12
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị