N'ihi na edebewom uzọ nile nke Jehova,
Emebighikwa m iwu n'ipu n'aka Chinekem.
N'ihi na ikpé-Ya nile di n'irum,
Ukpuru-Ya kwa, adighm-ewezuga ha n'ebe m'nọ.
M'we zue okè n'ebe Ọ nọ,
Edebe-kwa-ram onwem pua n'ajo omumem.
Jehova we meghachim dika ezi omumem si di,
Dika idi-ọcha akam abua n'anya-Ya si di.
N'ebe onye-ebere nọ I gēgosi Onwe-gi onye-ebere;
N'ebe nwoke zuru okè nọ I gēgosi Onwe-gi onye zuru okè;
N'ebe onye di ọcha nọ I gēgosi Onwe-gi onye di ọcha;
Ma n'ebe onye b͕agọro ab͕agọ nọ I gēgosi Onwe-gi onye-nb͕á.
N'ihi na Gi onwe-gi gāzọputa ndi ewedara n'ala;
Ma anya npako, I gēme ka ha di ala.
N'ihi na Gi onwe-gi gāmuye oriọnam:
Jehova, bú Chinekem, nēme kwa ka ọchichirim nwue enwu.
N'ihi na m'nēsite na Gi b͕a ọsọ ichu usu ndi nāpunara madu ihe;
Anamesite kwa na Chinekem wubiga mb͕idi.
Chineke, uzọ-Ya zuru okè:
Okwu-ọnu Jehova bu ihe anuchara anucha;
Ọta ka Ọ buru ndi nile nke nāb͕abà nime Ya.
N'ihi na ònye bu Chineke, ma-ọbughi Jehova?
Ònye bu kwa oké nkume, ma-ọbughi Chineke-ayi?
Ọ bu Chineke Nke ji ike kem dika ihe-ọkiké,
Ọ nēme kwa ka uzọm zue okè.
O nēdozi ukwum ka ha di ka ukwu nne-ele:
N'elu ebem di elu ka O nēguzokwam.
O nēzi akam abua ibu agha;
Ogwe-akam abua nārọgọ kwa uta ọla.
I nyewokwam ọta nzọputa-Gi:
Aka-nri-Gi nākwagidekwam,
Ume-ala-n'obi nke Gi nēmekwam ka m'ba uba.
I nēme ka nzọ-ukwum sa mbara n'okpurum,
Nkwonkwo-ukwum ab͕uchapughi kwa.
Anamachu ndi-irom, we rue ha aru:
Adighm-alaghachi kwa rue mb͕e emere ka ha gwusia.
Anam akwatu kwa ha, ha apughi kwa ibili ọzọ:
Ha nāda n'okpuru ukwum abua.
I nēji kwa ike kem dika ihe-ọkiké ibu agha:
I nēme ka ndi nēbili imegidem ruru ala n'okpurum.
Ndi-irom, I nyewokwam olu-ha
Ndi nākpọm asì, anamekpochapu kwa ha.
Ha nēti nkpu ka eyere ha aka, ma ọ dighi onye nāzọputa ha:
Ha nētiku Jehova, ma Ọ zaghi ha.
Anamasu kwa ha me ka ha di ka ájá n'iru ifufe:
Dika apiti èzí ka m'nāwupu ha.
I nēme ka m'b͕apu n'ilu-ọ̀gù nile nke ndim;
I nēdom onye-isi mba nile ọzọ
Ndi m'nāmaghi gēfèm òfùfè.
Mb͕e ha nuru na nti ha nēgem nti:
Ndi ala ọzọ nērube isi aghughọ n'okpurum.
Ndi ala ọzọ nāta aru,
Ma jijiji, si n'ebe-nmechibido-ha puta.
Jehova nādi ndu; Onye agọziri agọzi ka oké nkumem bu kwa;
Chineke nke nzọputam di kwa elu:
Bú Chineke ahu Nke nābọrọm ọ́bọ̀,
We duru ndi di iche iche bia n'okpurum.
Ọ nēme ka m'baputa n'aka ndi-irom:
I nēwelikwam elu kari ndi nēbili imegidem:
I nānaputam n'aka madu nēme ihe-ike.
N'ihi nka ka m'gēkele Gi, Jehova, n'etiti mba nile,
Aha-Gi ka m'gābùku kwa abù ọma.
Ọ nēme ka nzọputa eze-Ya di uku;
Ọ nēme-kwa-ra onye nke Ya etere manu ebere,
Bú Devid, Ọ nēme-kwa-ra nkpuru-ya ebere, rue mb͕e ebighi-ebi.