Jehova, nuru ezi omume, ṅa nti n'iti-nkpum; Ge nti n'ekperem, nke m'nējighi eb͕ub͕ere-ọnu aghughọ kpe. Ka ikpém si n'iru Gi puta; Anya-Gi nāhu izi-ezi. I nwawo obim; I letawom n'abali; I nuchawom, ma I dighi-achọputa ihe; Ezubewom na ọnum agaghi-agabiga ókè. Ma ọlu madu, site n'okwu eb͕ub͕ere-onu-Gi Ka mu onwem leziworo uzọ nile nke onye nēme ihe-ike anya. Nzọ-ukwum nile ejidewo okporo-uzọ-Gi nile, Ewezugaghi ije-ukwum n'ọnọdu-ha. Mu onwem akpọkuwo Gi, n'ihi na I nāzam, Chineke: Tọrọm nti-Gi n'ala, nuru okwu-ọnum. Me ka ebere-Gi nile guzo iche, Gi Onye ji aka-nri-Gi azọputa ndi nab͕abà nime Gi Site n'iru ndi nēbili imegide ha. Debem dika nwa-anya-Gi, Zobem n'okpuru ǹdò nkù-Gi, Site n'iru ndi nēmebi iwu, ndi nāpunaram ihe, Bú ndi-irom nēmegide nkpuru-obim, ndi nāb͕am buruburu.
Gụọ ABÙ ỌMA 17
Geere nke a ntị ABÙ ỌMA 17
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ABÙ ỌMA 17:1-9
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị