Jehova, zọputa; n'ihi na onye-ebere agwusiwo; N'ihi na ndi kwesiri ntukwasi-obi agwupuwo n'etiti umu madu. Ihe-efu ka ha nēkwurita, otù onye na ibe-ya: Eb͕ub͕ere-ọnu nke nēkwu okwu ire-utọ na obi abua ka ha ji ekwu. Ka Jehova bipu eb͕ub͕ere-ọnu nile nke nekwu okwu ire-utọ, Na ire nke nēkwu oké ihe: Ndi siworo, Ayi nēme ire-ayi ka ọ di ike; Eb͕ub͕ere-ọnu-ayi di n'akuku ayi: ònye ka ayi nwere dika onye-nwe-ayi? N'ihi ipunara ndi ewedara n'ala ihe, n'ihi isu-ude nke ndi-ob͕eye, Ub͕u a ka M'gēbili, ka Jehova kwuru; M'gēdo ya na nzọputa nke o nēkusi ume ike inwe. Okwu-ọnu Jehova nile bu okwu-ọnu di ọcha; Ha bu ọla-ọcha anuchaworo n'ite-nnucha nke nērusa n'ala, Nke esichaworo ub͕ò asa. Gi onwe-gi, Jehova, gēdebe ha, I gēchezi ha ka ha pua n'aka ọb͕ọ a rue mb͕e ebighi-ebi. Ndi nēmebi iwu nējeghari buruburu, Mb͕e anēbuli ihe jọb͕uru onwe-ya elu n'ebe umu madu nọ.
Gụọ ABÙ ỌMA 12
Geere nke a ntị ABÙ ỌMA 12
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ABÙ ỌMA 12:1-8
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị