Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ABÙ ỌMA 119:49-72

ABÙ ỌMA 119:49-72 IGBOB

Cheta okwu I gwara orù-Gi, Nke I meworom ka m'chere. Nka bu nkasi-obim nime nweda-n'alam: Na okwu-ọnu-Gi emewo ka m'di ndu. Ndi-nganga akwawom emò nke-uku: Ma esighm n'iwu-Gi wezuga onwem. Echetawom ikpé-Gi nile site na mb͕e ebighi-ebi, jehova, We kasie onwem obi. Iwe di ọku ejidewom, N'ihi ndi nēmebi iwu ndi nārapu iwu-Gi. Abù ọma ka ukpuru-Gi nile buruworom N'ulo ebe m'nọ dika ọbìa. Echetawom aha-Gi, Jehova, n'abali, We debe iwu-Gi. Nka ka m'nweworo, Na echebewom ihe-iriba-ama-Gi nile. Òkèm ka Jehova bu: Asiwom na m'gēdebe okwu-Gi nile. Ewerewom obim nile me ka iru-Gi dajua: Merem amara dika okwu-ọnu-Gi si di. Echèrem èchìchè uzọm nile, We me ka ukwum abua laghachi n'ihe-àmà-Gi nile. Abiaram ọsọsọ, ọ b͕agwojughkwam anya, Idebe ihe nile I nyere n'iwu. Udọ̀ nile nke ndi nēmebi iwu ehikọwom buruburu; Ma echezọghm iwu-Gi. N'etiti abali ka m'gēbili ikele Gi N'ihi ikpé nile nke ezi omume-gi. Onye ekekọtaworo mu na ndi nile nātu egwu Gi n'otù ka m'bu, Onye ekekọtaworo mu na ndi nēdebe ihe-iriba-ama-Gi nile n'otù. Jehova, uwa juputara n'ebere-Gi: Zím ukpuru-Gi nile. I meworo orù-Gi ezi ihe, Jehova, dika okwu-Gi si di. Zím idi-nma nke ezi uche na ihe-ọmuma; N'ihi na ọ bu n'ihe nile I nyere n'iwu ka m'kwereworo. Tutu ewedam n'ala mu onwem nēme ihe ọjọ n'amaghi-ama; Ma ub͕u a okwu-ọnu-Gi ka m'debeworo. Onye di nma ka I bu, na Onye nēme nma; Zím ukpuru-Gi nile. Ndi-nganga etekpuwom okwu-ugha dika ihe-ntekpu: Mu onwem gēwere obim nile chebe ihe-iriba-ama-Gi nile. Obi-ha bu nání abuba dika abuba; Ma mu onwem, ihe iwu-Gi nātọm utọ nke-uku. Ọ dim nma na ewedawom n'ala; Ka m'we muta ukpuru-Gi nile. Iwu ọnu-Gi dim nma Kari ọla-edo na ọla-ọcha nādighi iguta-ọnu.