Ọzọ, kwe ka ebere-Gi nile biakutem, Jehova, Bú nzọputa-Gi, dika okwu-ọnu-Gi si di. M'gāza kwa onye nātam uta okwu; N'ihi na atukwasiwom okwu-Gi obi. Anapusi-kwa-la okwu nke ezi-okwu n'ọnum; N'ihi na ikpé-Gi nile ka m'chereworo. M'gēdebe kwa iwu-Gi mb͕e nile Rue mb͕e nile ebighi-ebi. M'gējeghari kwa n'ebe sara mbara; N'ihi na ihe-iriba-ama-Gi nile ka m'chọworo. M'gēkwu kwa okwu bayere ihe-àmà-Gi nile n'iru ndi-eze, Ihere agaghi-emekwam. Ihe nke ihe nile I nyere n'iwu gātọkwam utọ nke-uku, Bú nke m'huworo n'anya. M'gāchili-kwa-ra ihe nile I nyere n'iwu ọbu-akam, bú ihe nke m'huworo n'anya; M'gātughari kwa uche n'ukpuru-Gi nile.
Gụọ ABÙ ỌMA 119
Geere nke a ntị ABÙ ỌMA 119
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ABÙ ỌMA 119:41-48
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị