Anyam abua buru nche-abali nile uzọ, Ka m'we tugharia uche n'okwu-ọnu-Gi. Nuru olum, dika ebere-Gi si di: Dika ikpé-Gi nile si di, Jehova, me ka m'di ndu. Ha abiaruwo nso bú ndi nāb͕aso nzube ọjọ; Ha nọ iwu-Gi n'ebe di anya. Gi onwe-gi nọ nso, Jehova; Ọzọ, ihe nile I nyere n'iwu bu ezi-okwu. Site na mb͕e ochie ka m'maworo site n'ihe-àmà-Gi nile, Na rue mb͕e ebighi-ebi ka I tọworo ntọ-ala-ha. Hu nweda-n'alam, dọputam; N'ihi na echezọghm iwu-Gi. Kpe ọnum b͕aputakwam: Dika okwu-ọnu-Gi si di, me ka m'di ndu.
Gụọ ABÙ ỌMA 119
Geere nke a ntị ABÙ ỌMA 119
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ABÙ ỌMA 119:148-154
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị