Oké ọlu ka ihe-àmà-Gi nile bu: N'ihi nka ka nkpuru-obim chebeworo ha. Nkpughepu okwu-Gi nile nēnye ìhè; Ọ nēmeka ndi nēnweghi uche ghọta ihe. Asaghepurum ọnum, ku kwa ume ike ike; N'ihi na achọsirim ihe nile I nyere n'iwu ike. Chem iru, me-kwa-ram amara, Dika I si eme ndi nāhu aha-Gi n'anya. Me ka nzọ-ukwum nile guzosie ike n'okwu-ọnu-gi: Ekwe-kwa-la ka ajọ ihe ọ bula buru onye-isim. B͕aputam na nmeb͕u nke madu: M'gēdebe kwa ihe-iriba-ama-Gi nile. Me ka iru-Gi nye orù-Gi ìhè; Zíkwam ukpuru-Gi nile. Anya-miri nke di ka ọtutu miri-iyi nāb͕a anyam abua, N'ihi na ha edebeghi iwu-Gi. Onye ezi omume ka I bu Jehova, Ọzọ, ihe ziri ezi ka ikpé-Gi nile bu. I nyewo ihe-àmà-Gi nile iwu n'ezi omume Na ikwesi-ntukwasi-obi di uku. Ekworom ekpochapuwom, N'ihi na ndi nākpab͕um echezọwo okwu-Gi nile. Ihe anuchara anucha nke-uku ka okwu-ọnu-Gi bu; Orù-Gi ahuwo kwa ya n'anya. Onye ntà ka m'bu, na onye anēleda anya: Ma echezọghm ihe-iriba-ama-Gi nile. Ezi omume-Gi bu ezi omume nādiru mb͕e ebighi-ebi, Iwu-Gi bu kwa ezi-okwu Ahuhu na nkpà achọtawom: Ma ihe nile I nyere n'iwu bu ihe nātọm utọ nke-uku. Ihe-àmà-Gi nile bu ezi omume rue mb͕e ebighi-ebi: Me ka m'ghọta ihe, m'gādi kwa ndu.
Gụọ ABÙ ỌMA 119
Geere nke a ntị ABÙ ỌMA 119
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ABÙ ỌMA 119:129-144
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị