Chineke nke otutom, ab͕ala nkiti; N'ihi na ọnu onye nēmebi iwu na ọnu aghughọ ka ha sagheworo megidem: Ha ewerewo ire okwu-ugha gwam okwu. Ha ewerewo kwa okwu ikpọ-asì b͕am buruburu, We busom agha n'efu. N'ọnọdu ihu-n'anya m'huru ha ha nēmegidem: Ma mu onwem nọ nēkpe ekpere. Ha we tukwasim ihe ọjọ n'ọnọdu ezi ihe, Na ikpọ-asì n'ọnọdu ihu-n'anyam. Me ka onye nēmebi iwu lekọta ya: Ka onye-nmegide guzo kwa n'aka-nri-ya. Mb͕e anēkpe ya ikpe, ya puta ìhè na ọ bu onye ikpe mara; Ka ekpere-ya ghọ kwa nmehie. Ka ubọchi-ya di ole-na-ole; Ka onye ọzọ nara ya ihe-nlekọta-ya. Ka umu-ya buru umu-nb͕ei, Ka nwunye-ya buru nwayi di-ya nwuru. Ka umu-ya nāṅaghari kwa mb͕e nile nāriọ kwa aririọ; Ka ha si kwa na nkponkpọ-ebe-ha nile nāchọ ihe-oriri-ha n'ebe di anya. Ka onye-nbinye siri ihe nile o nwere ọnyà; Ka ndi ala ọzọ luta ihe ọ dọb͕uru onwe-ya n'ọlu inweta n'agha. Ekwela ka o nwe onye nọ nēmere ya ebere; Ekwe-kwa-la ka onye ọ bula di nke nēmere umu-nb͕ei-ya amara. Ka eriri-umu-ya diri nbipu; N'ọb͕ọ soro ha ka ehichapu aha-ha. Ka echetara Jehova ajọ omume nna-ya-hà; Ekwe-kwa-la ka ehichapu nmehie nne-ya. Ka ha di n'iru Jehova mb͕e nile, Ka O we bipu ncheta-ha n'uwa. N'ihi na o chetaghi ime ebere, O we sob͕ue nwoke ewedara n'ala na ob͕eye, Na onye obi-ya mebiri emebi, ime ka ha nwua. Ọ hu-kwa-ra nkọcha n'anya, o we biakute ya; Ngọzi atọghi kwa ya utọ, o we di anya n'ebe ọ nọ. O yiri-kwa-ra nkọcha dika uwe-nwuda-ya, O we ba nime ya dika miri, Ba kwa n'ọkpukpu-ya nile dika manu. Ya diri ya ka uwe oji kpuchi onwe-ya, Ya buru kwa akpukpọ-úkwù o ji ke úkwù mb͕e nile. Nka bu ugwọ-ọlu nke ndi nēmegidem, nke nēsi n'aka Jehova bia, Ọ bu kwa ugwọ-ọlu nke ndi nēkwu ihe ọjọ megide nkpuru-obim.
Gụọ ABÙ ỌMA 109
Geere nke a ntị ABÙ ỌMA 109
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ABÙ ỌMA 109:1-20
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị