O we me ka ha puta chiri ọla-ọcha na ọla-edo: Ọ dighi kwa onye nāsu ngọngọ n'etiti ebo-Ya nile. Ijipt ṅuriri mb͕e ha putara; N'ihi na oké egwu-ha dakwasiri ha. Ọ b͕asara igwe-oji ibu ihe-nkpuchi; Na ọku inye ìhè n'abali. Ha riọrọ, O we me ka nnunu quail bia, O were kwa nri nke elu-igwe me ka afọ ju ha. O meghere oké nkume, miri we rùputa; Ha nērù n'ala ọkpọ-nku dika osimiri. N'ihi na O chetara okwu nsọ Ya, Na Abraham, bú orù-Ya. O we me ka ndi-Ya ji obi-utọ puta, Me kwa ndi Ọ rọputaworo ka ha ji iti-nkpu-ọṅù puta. O we nye ha ala nile nke mba Kenean nile; Ọ bu kwa ihe ndi ọzọ di iche iche dọb͕uru onwe-ha n'ọlu inwe ka ha nwetara: Ka ha we debe ukpuru-Ya nile, Riba kwa iwu-Ya nile ama. Tonu Ja.
Gụọ ABÙ ỌMA 105
Geere nke a ntị ABÙ ỌMA 105
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ABÙ ỌMA 105:37-45
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị