Jehova nēmere ndi nile anēmeb͕u Ezi omume nile na ihe nile O kpere n'ikpe. Ọ nēme ka Moses mara uzọ-Ya nile, Ọ nēme kwa ka umu Israel mara omume-Ya nile. Jehova nwere obi-ebere, nēme kwa amara, Ọ dighi-ewe iwe ọsọsọ, Ọ nāba kwa uba n'ebere. Ọ bughi rue mgbe nile ka Ọ ganēse okwu; Ọ bughi kwa rue mb͕e ebighi-ebi ka Ọ ganēdebe iwe. Ọ bughi dika nmehie nile ayi si di ka O meworo ayi, Ọ bughi kwa dika ajọ omume nile ayi si di ka O mesoworo ayi. N'ihi na dika idi-elu nke elu-igwe si di n'elu uwa, Otú a ka ebere-Ya di ike n'aru ndi nātu egwu Ya. Dika Iru-anyanwu si di anya n'Ọdida-anyanwu, Otú a ka O meworo ka njehie nile ayi di anya n'ebe ayi nọ. Dika nna si enwe obi-ebere n'aru umu-ya, Otú a ka Jehova nwere obi-ebere n'aru ndi nātu egwu Ya. N'ihi na Ya onwe-ya mara otú akpuworo ayi; Ọ nēcheta na ájá ka ayi bu. Ma madu, dika ahihia ka ubọchi-ya nile di; Dika okoko-osisi ọhia, otú a ka ọ nāwa okoko. N'ihi na ifufe agabigawo ya n'isi, o we ghara idi; Ọnọdu-ya agaghi-ama kwa ya ọzọ. Ma ebere nke Jehova nēsi na mb͕e ebighi-ebi we rue mb͕e ebighi-ebi n'aru ndi nātu egwu Ya, Ezi omume-Ya di-kwa-ra umu umu; Ọ diri ndi nēdebe ọb͕ub͕a-ndu-Ya, Di-kwa-ra ndi nēcheta ukpuru-Ya ime ha. Jehova emewo ka oche-eze-Ya guzosie ike n'elu-igwe; Ala-eze-Ya nāchi kwa ihe nile. Gọzienu Jehova, ndi-mọ-ozi-Ya, Unu ndi-dike di ike, ndi nēme okwu-Ya, N'ige nti olu nke okwu-Ya. Gọzienu Jehova, usu-ndi-agha-Ya nile; Unu ndi nējere Ya ozi, ndi nēme ihe nātọ Ya utọ. Gọzienu Jehova, unu ọlu-Ya nile, N'ebe nile Ọ nāchi: Gọzie Jehova, nkpuru-obim.
Gụọ ABÙ ỌMA 103
Geere nke a ntị ABÙ ỌMA 103
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ABÙ ỌMA 103:6-22
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị