Gọzie Jehova, nkpuru-obim; Ka ihe nile nke di nimem gọzi kwa aha nsọ Ya. Gọzie Jehova, nkpuru-obim, Echezọ-kwa-la nmeso ọma Ya O nēmeso gi: Bú Onye nāb͕aghara gi ajọ omume-gi nile; Onye nāgwọ ọria-gi nile; Onye nāb͕aputa ndu-gi n'aka nbibi; Onye nēkpube gi okpu-eze, bú ebere na obi-ebere di iche iche: Onye nēwere ezi ihe me ka afọ ju ọnu-gi; Idi-na-nwata-gi ewe me onwe-ya ka ọ di ọhu dika ugo. Jehova nēmere ndi nile anēmeb͕u Ezi omume nile na ihe nile O kpere n'ikpe. Ọ nēme ka Moses mara uzọ-Ya nile, Ọ nēme kwa ka umu Israel mara omume-Ya nile. Jehova nwere obi-ebere, nēme kwa amara, Ọ dighi-ewe iwe ọsọsọ, Ọ nāba kwa uba n'ebere. Ọ bughi rue mgbe nile ka Ọ ganēse okwu; Ọ bughi kwa rue mb͕e ebighi-ebi ka Ọ ganēdebe iwe. Ọ bughi dika nmehie nile ayi si di ka O meworo ayi, Ọ bughi kwa dika ajọ omume nile ayi si di ka O mesoworo ayi. N'ihi na dika idi-elu nke elu-igwe si di n'elu uwa, Otú a ka ebere-Ya di ike n'aru ndi nātu egwu Ya. Dika Iru-anyanwu si di anya n'Ọdida-anyanwu, Otú a ka O meworo ka njehie nile ayi di anya n'ebe ayi nọ. Dika nna si enwe obi-ebere n'aru umu-ya, Otú a ka Jehova nwere obi-ebere n'aru ndi nātu egwu Ya. N'ihi na Ya onwe-ya mara otú akpuworo ayi; Ọ nēcheta na ájá ka ayi bu. Ma madu, dika ahihia ka ubọchi-ya nile di; Dika okoko-osisi ọhia, otú a ka ọ nāwa okoko. N'ihi na ifufe agabigawo ya n'isi, o we ghara idi; Ọnọdu-ya agaghi-ama kwa ya ọzọ. Ma ebere nke Jehova nēsi na mb͕e ebighi-ebi we rue mb͕e ebighi-ebi n'aru ndi nātu egwu Ya, Ezi omume-Ya di-kwa-ra umu umu; Ọ diri ndi nēdebe ọb͕ub͕a-ndu-Ya, Di-kwa-ra ndi nēcheta ukpuru-Ya ime ha. Jehova emewo ka oche-eze-Ya guzosie ike n'elu-igwe; Ala-eze-Ya nāchi kwa ihe nile. Gọzienu Jehova, ndi-mọ-ozi-Ya, Unu ndi-dike di ike, ndi nēme okwu-Ya, N'ige nti olu nke okwu-Ya. Gọzienu Jehova, usu-ndi-agha-Ya nile; Unu ndi nējere Ya ozi, ndi nēme ihe nātọ Ya utọ. Gọzienu Jehova, unu ọlu-Ya nile, N'ebe nile Ọ nāchi: Gọzie Jehova, nkpuru-obim.
Gụọ ABÙ ỌMA 103
Geere nke a ntị ABÙ ỌMA 103
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ABÙ ỌMA 103:1-22
5 Ụbọchị
Echiche Akwụkwọ Nsọ banyere Abụ Ọma 103:1-5. A dụrụ anyị ọdụ ka anyị jiri ihe niile dị n'ime anyị gọzie Onyenwe anyị, ebe anyị maara na ọ na-azọpụta, na-agwọ ọrịa, na-eweghachi ma na-eme ka ndụ anyị dị ọhụrụ.
7 Days
What would happen if you woke up and reminded yourself of the Gospel every day? This 7-day devotional seeks to help you do just that! The Gospel not only saves us, it also sustains us throughout our lives. Author and Evangelist Matt Brown has formed this reading plan based on the 30-day devotional book written by Matt Brown and Ryan Skoog.
Ụbọchị 7
Ị nọghịcha n'ọnụ na ụwa? Na ọnwa 7 na-akpọ ihe na-eme ihe gbasara iji nweta nkwado ịgụ ụbọchị gbasara Kristi niile n'ime gbasara
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị