ILU 9:10-18
ILU 9:10-18 IGBOB
Nmalite amam-ihe ka egwu Jehova bu: Ihe-ọmuma nke Onye Nsọ bu kwa nghọta. N'ihi na site na mu ka ubọchi-gi gāba uba, Agātukwasi-kwa-ra gi arọ ndu. Ọ buru na i mara ihe, i maworo onwe-gi ihe: Ọ buru kwa na i kwa emò, nání gi gēbu ya. Nwanyi nzuzu nēme nkpọtu; Onye nēnweghi uche ka ọ bu, ọ maghi kwa ihe ọ bula. Ọ nānọdu kwa n'ọnu-uzọ ulo-ya, N'elu oche n'ebe nile di elu nke obodo, Ikpọ ndi nāgabiga n'uzọ òkù, Bú ndi nāgazi agazi n'okporo-uzọ-ha, Onye ọ bula nēnweghi uche, ya wezuga onwe-ya bata n'ebe a: Ọzọ, onye obi amam-ihe kọrọ, nwanyi ahu asiwo ya, Miri ezutara ezuta nātọ utọ, Nri eriri na nzuzo di utọ. Ma nwoke ahu amaghi na ndi nādighi ndu nọ n'ebe ahu; Na ọ bu n'ebe nile miri emi nke ala-mọ ka ndi ọ kpọrọ nọ.

