Amam-ihe, ọ̀ dighi-akpọ òkù?
Nghọta kwa, ọ̀ dighi-eme ka olu-ya da udà?
N'elu ebe nile di elu n'akuku uzọ,
N'ab͕ata uzọ nile, ka O guzoworo onwe-ya;
N'akuku ọnu-uzọ-ama nile, n'ọnu amá obodo,
Na nbata ọnu-uzọ nile, ka ọ nētisi nkpu ike, si,
Ọ bu unu, madu, ka m'nākpọku;
Olum nādaku kwa umu madu.
Unu ndi nēnweghi uche, ghọtanu ezi uche;
Unu ndi-nzuzu kwa, menu ka obi-unu ghọta ihe.
Nurunu, n'ihi na isi ihe di iche iche ka m'nēkwu;
Nsaghe eb͕ub͕ere-ọnum gābu kwa ihe di iche iche ziri ezi.
N'ihi na ezi-okwu ka okpo-ọnum nēkwu dika onye nātughari uche;
Ọzọ, ihe-árú nke eb͕ub͕ere-ọnum ka nmebi-iwu bu.
N'ezi omume ka okwu nile nke ọnum di;
Ọ dighi ihe nēzighi ezi ma-ọbu ihe b͕agọrọ ab͕agọ di nime ha.
Ha nile putara ìhè n'ebe onye-nghọta nọ,
Ha zi-kwa-ra ezi n'ebe ndi nāchọta ihe-ọmuma nọ.
Nara idọ-aka-na-ntim, anara-kwa-la ọla-ọcha;
Nara kwa ihe-ọmuma kari ọla-edo ọma arọputara arọputa.
N'ihi na amam-ihe di nma kari ruby;
Ihe nile kwa nke nātọ madu utọ, ha agaghi-ara ka ya.
Mu onwem, bú amam-ihe, emewo ezi uche ebe-obibim,
Ọ bu kwa ọmuma ihe-ìzùzù di iche iche ka m'nāchọputa.
Egwu Jehova bu ikpọ ihe ọjọ asì:
Npako, na nganga, na uzo ọjọ,
Na ọnu nēkwu okwu ib͕akuta Chineke azu, ka m'kpọworo asì.
Mu nwe ndum-ọdu na nzube-ihe:
Mu onwem bu nghọta; mu nwe idi-ike.
Mu ka ndi-eze ji abu eze,
Ọ bu kwa mu ka ndi nāchi achi ji enye ukpuru, bú ezi omume.
Mu ka ndi-isi ji abu ndi-isi,
Ha na ndi amara aha-ha, bú ndi-ikpe nile nke uwa.
Mu onwem nāhu ndi ahu n'anya, bú ndi nāhum n'anya;
Ọ bu kwa ndi nāchọsim ike gāchọtam.
Àkù na nsọpuru di n'akam;
E, àkù nke nādigide na ezi omume.
Nkpurum di nma kari ọla-edo ọma, e, kari ọla-edo anuchara anucha;
Ihe-omumem di kwa nma kari ọla-ọcha arọputara arọputa.
N'uzọ ezi omume ka m'nēje ije,
N'etiti okporo-uzọ nile nke ikpé:
Ime ka ndi nāhum n'anya keta ihe di adi,
Ka m'we meju kwa ulo-àkù nile ha.