Ihe isi di nke Jehova kpọrọ asì; E, ihe asa di nke bu ihe-árú nke nkpuru-obi-Ya: Anya di elu, na ire okwu-ugha, Na aka nāwusi ọbara nēmeghi ihe ọjọ; Na obi nke nēchèputa èchìchè ajọ ihe, Na ukwu nēme ngwa ib͕aga n'ihe ọjọ; Na onye-àmà okwu-ugha nke nēkupu okwu-ugha di iche iche dika ume, Na onye nēzisa ise-okwu n'etiti umu-nne. Nwam, chebe ihe nna-gi nyere n'iwu, Arapu-kwa-la iwu nne-gi: Hie ha n'obi-gi mb͕e nile, Ke ha n'olu-gi. Mb͕e i nējeghari, ọ ganēdu gi; Mb͕e i nēdina ala, ọ ganēche gi; Mb͕e i teta-kwa-ra, nke ahu gēso gi kparia uka. N'ihi na oriọna ka ihe ahu enyere n'iwu bu; iwu ahu bu kwa ìhè; Ọ bu kwa uzọ ndu ka iba-nba nile nke idọ-aka-na-nti bu: Idebe gi ka i pua n'aka nwayi ọjọ, N'aka ire-utọ nke ire nwayi nābughi nwunye-gi. Achọsila ima-nma-ya ike n'obi-gi; Ekwe-kwa-la ka o were gi na mbubere-anya-ya. N'ihi na ọ bu n'ihi nwayi nākwa iko ka eji eme ka nwoke biarue nání otù ob͕e achicha: Nwunye nwoke ọzọ nāchu kwa ntá ndu di oké ọnu-ahia. Madu, ọ̀ gāguru ọku tiye n'uwe obi-ya, Ma uwe-ya agaghi-ere ọku? Ma-ọbu madu, ọ̀ gēje ije n'elu icheku-ọku, Ma ọku agaghi-aru ya n'ukwu-ya abua? Otú a ka onye nābakuru nwunye madu-ibe-ya di; Agaghi-agu onye ọ bula nke nēmetu nwayi ahu aka n'onye nēmeghi ihe ọjọ. Madu adighi-eleda onye-ori anya, mb͕e o nēzu ori Imeju nkpuru-obi-ya mb͕e agu nāgu ya: Ma asi na achọta ya, ọ gākwughachi okpukpu asa; Àkù nile nke ulo-ya ka ọ gēnye. Onye nākwa nwayi iko, obi amam-ihe kọrọ ya: Onye nēmebi nkpuru-obi nke aka ya ka onye nēme ya bu. Ọnyá-ntiputa na nlelì ka ọ gāhu; Ita-uta-ya kwa, agaghi-ehichapu ya. N'ihi na ekworo bu ọnuma nke nwoke; Ọ gaghi-enwe ọmiko n'ubọchi ọ́bọ̀. Ọ gaghi-ahu ihe-ikpuchi-nmehie ọ bula iru ọma; Ọ gaghi-ekwe kwa, mb͕e i gēme ka ihe-iri-ngo ba uba.
Gụọ ILU 6
Geere nke a ntị ILU 6
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ILU 6:16-35
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị