Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ILU 4:20-27

ILU 4:20-27 IGBOB

Nwam, ṅa nti n'okwum nile; Tọ nti-gi n'ala n'okwu-ọnum nile. Ekwela ka ha si n'anya-gi abua wezuga onwe-ha; Debe ha n'etiti obi-gi. N'ihi na ndu ka ha buru ndi nachọta ha, Ha bu kwa ihe nāgwọ anu-aru-ha nile. Kari ihe-ndebe-gi nile chebe obi-gi; N'ihi na site na ya ka nputa nile nke ndu di. Si n'ebe i nọ wezuga ọnu nēkwu ihe b͕agọrọ ab͕agọ, Me kwa ka eb͕ub͕ere-ọnu nke nēkwuhie ekwuhie di anya n'ebe i nọ. Ka anya-gi abua legide n'iru, Ka mbubere-anya-gi lezi kwa n'iru gi. Me ka okporo-uzọ nke ukwu-gi abua di lari, Ka edozi kwa uzọ-gi nile. Ewezugala onwe-gi n'aka-nri ma-ọbu n'aka-ekpe: Si n'ihe ọjọ wezuga ukwu-gi.