Okwu Lemuel, bú eze; ibu eboro ya nke nne-ya ji dọ ya aka na nti.
Gini, nwam? gini kwa, nwa nke afọm?
Gini kwa, nwa nke nkwa nile m'kwere?
Enyela ndinyom ike-gi,
Enye-kwa-la ihe nēbibi ndi-eze uzọ-gi nile.
Ka ndi-eze ghara iṅu manya-vine, Lemuel, ka ndi-eze ghara iṅu manya-vine;
Ka ndi-isi ghara kwa isi, Òle ebe ka ihe-ọṅuṅu nke nābà n'anya di?
Ka ha we ghara iṅu, we chezọ ukpuru atọrọ,
We b͕anwe ikpé nke ndi nile ewedara n'ala.
Nyenu onye nāla n'iyì ihe-ọṅuṅu nābà n'anya,
Nye-kwa-nu ndi nkpuru-obi-ha di ilu manya-vine:
Ya ṅua, we chezọ ob͕eye ọ bu,
Ghara kwa icheta ọnọdu ọjọ ya ọzọ.
Saghere onye-ob͕i ọnu-gi,
N'okwu-ikpe nke ndi nile nāla n'iyì.
Saghe ọnu-gi, kpe ikpe n'ezi omume,
Kpeputa kwa onye ewedara n'ala na ob͕eye.
Nwayi nke nējide onwe-ya nke-ọma, ònye gāchọputa ya?
N'ihi na ọnu-ahia-ya kariri ruby nke-uku.
Obi di-ya atukwasiwo ya obi,
Ọ dighi kwa ihe-nkwata nākọ nwoke ahu.
Nwayi ahu emesowo ya ezi ihe, ọ bughi kwa ihe ọjọ,
Ubọchi nile nke ndu-ya.
Ọ chọwo aji-anu na flax,
We nālu ọlu nātọ aka-ya abua utọ.
Ọ di ka ub͕ọ onye-ahia;
Site n'ebe di anya ka ọ nēweta nri-ya.
O nēbili kwa mb͕e abali nādi kwa,
We nye ulo-ya nri,
Nye kwa umu-ab͕ọghọ-ya òkè-ha.
O zuwo izùzù ọhia, we nweta ya:
Site n'ihe aka-ya abua lutara ka ọ kuworo ubi-vine.
O kewo ike n'úkwù-ya dika ihe-ọkiké,
Me kwa ka ogwe-aka-ya abua nwe ume.
Ọ matawo na ihe-ahia-ya di nma:
Oriọna-ya adighi-anyu n'abali.
Aka-ya abua ka o setiworo n'osisi ikuku ogho,
Ọbu-aka-ya abua ejidesiwo kwa ozele ike.
Ọbu-aka-ya ka ọ b͕asapuworo nye onye ewedara n'ala;
E, aka-ya abua ka o setiworo rue ob͕eye aru.
Ọ dighi-atu egwu snow, na ọ gēme ulo-ya ihe;
N'ihi na ulo-ya nile nēyi uwe uhie.