Mara ihe, nwam, we me ka obim ṅuria, Ka m'we zaghachi onye nātam uta okwu. Onye nwere ezi uche ahuwo ihe ọjọ, we zobe onwe-ya: Ma ndi nēnweghi uche agabigawo, ewe rie ha nra. Chiri uwe-ya, bú onye nọworo onye ala ọzọ na mbe; N'ọnọdu nwanyi nābughi nwunye-ya nara ya onwe-ya n'ihe-ibe. Onye ji oké olu agọzi madu-ibe-ya, nke nēbili n'isi-ututu ime ya, Nkọcha ka agāgu ngọzi ahu nye ya. Miri-ọtutu nke nātu mb͕e nile n'ubọchi oké miri-ozuzo, Ya na nwanyi nke nēse okwu yiri: Onye nēzobe ya ezobewo ifufe, Ọ bu kwa manu ka aka-nri-ya nēzute. Ígwè nāmucha ígwè; Otú a ka madu nāmucha iru eyì-ya. Onye nēche osisi fig gēri nkpuru-ya; Ọ bu kwa onye nāriba onye-nwe-ya ama ka agāsọpuru. Dika miri si eme ka iru hu iru, Otú a ka obi nēme ka madu hu madu.
Gụọ ILU 27
Geere nke a ntị ILU 27
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ILU 27:11-19
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị