ILU 22:17-20
ILU 22:17-20 IGBOB
Tọ nti-gi n'ala, nu okwu nile nke ndi mara ihe, Tukwasi kwa obi-gi n'ihe-ọmumam. N'ihi na ọ di utọ mb͕e i debe ha n'afọ-gi, Mb͕e ha gēguzosi ike n'otù n'elu eb͕ub͕ere-ọnu-gi abua. Ọ bu ka ntukwasi-obi-gi we di na Jehova Ka m'meworo ka i mara ha ta, ọbuná gi onwe-gi. Èdetaghm i isi ihe Nime ndum-ọdu di iche iche na ihe-ọmuma

